Mmetụta

by

E gosiputara ya

onyonyo ọdịnaya
onyonyo ọdịnaya

Obi m na-enwe ọtụtụ ihe.

  1. Chee echiche banyere mmetụta dị iche iche ị nwere. Ole ka ị ga-eche banyere ya?
  2. Kọọ akụkọ gbasara oge ị nwere otu n'ime mmetụta ndị ahụ.
  3. Mmetụta gị ọ̀ dabara n'ìgwè ole na ole? Dịka ọmụmaatụ, ha niile ọ̀ bụ obi ụtọ ka ọ̀ bụ mwute?
onyonyo ọdịnaya

Obi na-atọ m ụtọ mgbe nne nne m na-akọ akụkọ n'uhuruchi.

  1. Ị maara onye pụrụ iche nke na-enwe mmasị ịkọ akụkọ? Ọ̀ na-eme ka obi dị gị ụtọ ịnụ onye ahụ na-akọ akụkọ?
  2. Gụkọta ọnụ ọnụ ole ụmụaka na-ege akụkọ nne nne. Ọ bụrụ na ị tinye nne nne na ọnụ ọgụgụ ahụ, ọ ga-abụ otu ọzọ - ole ka nke ahụ ga-eme?
  3. Ụmụaka ndị a hà dị ka ndị nwere obi ụtọ? Kedu ka ị ga-esi mara?
onyonyo ọdịnaya

M na-enwe mmetụta nzuzu mgbe m na enyi m na-egwuri egwu.

  1. Kedu ihe ị na-eme mgbe ị na-eme nzuzu?
  2. Gụọ aka, ụkwụ, anya, imi, mkpịsị aka, mkpịsị ụkwụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ị hụrụ ọnụ.
  3. Kedụ otu ihe nwere ọnụọgụgụ kachasị na nke kacha nta?
onyonyo ọdịnaya

Obi na-ajọ m njọ mgbe papa m kwuru na ya enweghị ego.

  1. Ụdị ihe ndị dị aṅaa na-eme ka ị na-enwe mwute?
  2. Tụ aka ma kpọọ aha agba nke uwe dị iche iche ha.
  3. Gụọ ọnụọgụ bọtịnụ dị n'uwe ya.
onyonyo ọdịnaya

Ahụrụ m n'anya mgbe mama m makụrụ m.

  1. Kedụ oge pụrụ iche ndị na-eme ka ị hụ onwe gị n'anya?
  2. Gịnị ka ị na-eme iji mee ka ndị ọzọ mara na ị hụrụ ha n'anya?
  3. Uwe nne nwere akara, nke nwa agbọghọ ahụ nwekwara kpakpando. Ị nwere uwe nwere kpakpando ma ọ bụ ụdị ndị ọzọ dị na ha?

I nwere ike ibudata, detuo, tụgharịa ma ọ bụ gbanwee akụkọ a ma jiri ihe osise ndị ahụ ma ọ bụrụhaala na ị na-akọwa ha n'ụzọ ndị a:

Mmetụta
Odee - Clare Verbeek, Thembani Dladla na Zanele Buthelezi
Ihe osise — Kathy Arbuckle
Asụsụ — Bekee
Ọkwa - Okwu mbụ
© Ụlọ Akwụkwọ Mmụta na Mmepe (Ebe Agụmakwụkwọ Ndị Okenye), Mahadum Kwazulu-Natal 2007
Ihe Ndị A Na-ahụkarị n'Aka: 3.0 nke Enweghị Azụmahịa
Isi mmalite www.africanstorybook.org
Isi mmalite https://cae.ukzn.ac.za/resources/seedbooks.aspx

Na Mbụ
Page 1 nke 6
Osote